Native Bible

Amos 2:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Moab, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha surere ọkpụkpụ eze ndị Edọm ọkụ, mee ha ka ha ghọọ ntụ.

Amos 2:1 in English

Amos 2:1 · Berean Standard Bible

This is what the LORD says: “For three transgressions of Moab, even four, I will not revoke My judgment,* because he burned to lime the bones of Edom’s king.

Context

1Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Moab, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha surere ọkpụkpụ eze ndị Edọm ọkụ, mee ha ka ha ghọọ ntụ. 2Ya mere, aga m ezite ọkụ na Moab, nke ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Keriọt. Moab ga-anwụ nʼime ọgbaaghara, nʼetiti mkpu agha, na ụda opi ike. 3Aga m ala onyeisi ọchịchị ya nʼiyi, gbukwaa ndị ozi niile nọ nʼokpuru ya.” Ọ bụ Onyenwe anyị na-ekwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.