Emọs 2:1
Amos 2:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Nʼihi njehie atọ nke Moab, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha surere ọkpụkpụ eze ndị Edọm ọkụ, mee ha ka ha ghọọ ntụ.
Amos 2:1 in English
Amos 2:1 · Berean Standard Bible
This is what the LORD says: “For three transgressions of Moab, even four, I will not revoke My judgment,* because he burned to lime the bones of Edom’s king.
Context
1Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,
“Nʼihi njehie atọ nke Moab,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na ha surere ọkpụkpụ eze ndị Edọm ọkụ,
mee ha ka ha ghọọ ntụ. 2Ya mere, aga m ezite ọkụ na Moab,
nke ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Keriọt.
Moab ga-anwụ nʼime ọgbaaghara,
nʼetiti mkpu agha, na ụda opi ike. 3Aga m ala onyeisi ọchịchị ya nʼiyi,
gbukwaa ndị ozi niile nọ nʼokpuru ya.”
Ọ bụ Onyenwe anyị na-ekwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.