Emọs 2:12
Amos 2:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma unu mere* ka ndị Nazirait ahụ ṅụọ mmanya. Unu nyekwara ndị amụma iwu ka ha kwụsị ibu amụma.
Amos 2:12 in English
Amos 2:12 · Berean Standard Bible
“But you made the Nazirites drink wine and commanded the prophets not to prophesy.
Context
10Esitere m nʼala Ijipt kpọpụta unu,
duru unu gafee nʼọzara iri afọ anọ,
ime ka unu nweta ala ndị Amọrait. 11“Ahọpụtara m ụmụ unu ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma,
họpụtakwa ụfọdụ ndị okorobịa unu ka ha bụrụ Nazirait.
Unu ndị Izrel, unu ga-agọ na nke a abụghị eziokwu?”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya. 12“Ma unu mere* ka ndị Nazirait ahụ ṅụọ mmanya.
Unu nyekwara ndị amụma iwu ka ha kwụsị ibu amụma. 13“Nʼihi ya, aga m abịada unu nʼala nʼọnọdụ unu,
dịka ụgbọala nke e bujuru ukwu ọka si abịada. 14Ịgba ọsọ agaghị azọpụta ọ bụladị ndị dị nwe ụkwụ ọsọ,
ndị dị ike agaghị agba onwe ha ume,
ndị bụ dike nʼagha agaghị azọpụta onwe ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.