Emọs 2:11
Amos 2:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ahọpụtara m ụmụ unu ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma, họpụtakwa ụfọdụ ndị okorobịa unu ka ha bụrụ Nazirait. Unu ndị Izrel, unu ga-agọ na nke a abụghị eziokwu?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya.
Amos 2:11 in English
Amos 2:11 · Berean Standard Bible
I raised up prophets from your sons and Nazirites from your young men. Is this not true, O children of Israel?” declares the LORD.
Context
9“Ma a lara m ndị Amọrait nʼiyi nʼihu ha,
ndị ahụ dị ogologo dịka osisi sida,
ndị sikwara ike dịka osisi ook.
Alara m mkpụrụ ha dị nʼelu,
na mgbọrọgwụ ha niile dị nʼokpuru nʼiyi. 10Esitere m nʼala Ijipt kpọpụta unu,
duru unu gafee nʼọzara iri afọ anọ,
ime ka unu nweta ala ndị Amọrait. 11“Ahọpụtara m ụmụ unu ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma,
họpụtakwa ụfọdụ ndị okorobịa unu ka ha bụrụ Nazirait.
Unu ndị Izrel, unu ga-agọ na nke a abụghị eziokwu?”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya. 12“Ma unu mere* ka ndị Nazirait ahụ ṅụọ mmanya.
Unu nyekwara ndị amụma iwu ka ha kwụsị ibu amụma. 13“Nʼihi ya, aga m abịada unu nʼala nʼọnọdụ unu,
dịka ụgbọala nke e bujuru ukwu ọka si abịada.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.