Emọs 2:13
Amos 2:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi ya, aga m abịada unu nʼala nʼọnọdụ unu, dịka ụgbọala nke e bujuru ukwu ọka si abịada.
Amos 2:13 in English
Amos 2:13 · Berean Standard Bible
Behold, I am about to crush you in your place as with a cart full of grain.
Context
11“Ahọpụtara m ụmụ unu ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma,
họpụtakwa ụfọdụ ndị okorobịa unu ka ha bụrụ Nazirait.
Unu ndị Izrel, unu ga-agọ na nke a abụghị eziokwu?”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya. 12“Ma unu mere* ka ndị Nazirait ahụ ṅụọ mmanya.
Unu nyekwara ndị amụma iwu ka ha kwụsị ibu amụma. 13“Nʼihi ya, aga m abịada unu nʼala nʼọnọdụ unu,
dịka ụgbọala nke e bujuru ukwu ọka si abịada. 14Ịgba ọsọ agaghị azọpụta ọ bụladị ndị dị nwe ụkwụ ọsọ,
ndị dị ike agaghị agba onwe ha ume,
ndị bụ dike nʼagha agaghị azọpụta onwe ha. 15Ndị na-agba ụta agaghị agbata ihe ọbụla,
ndị nwere ụkwụ ọsọ agaghị enwekwa ike ịgba ọsọ.
Ọ bụladị onye ịgba ịnyịnya doro anya agakwaghị enwe ike ịgbanarị ihe mberede nke ga-abịakwasị ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.