Native Bible

Amos 2:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị na-agba ụta agaghị agbata ihe ọbụla, ndị nwere ụkwụ ọsọ agaghị enwekwa ike ịgba ọsọ. Ọ bụladị onye ịgba ịnyịnya doro anya agakwaghị enwe ike ịgbanarị ihe mberede nke ga-abịakwasị ya.

Amos 2:15 in English

Amos 2:15 · Berean Standard Bible

The archer will not stand his ground, the fleet of foot will not escape, and the horseman will not save his life.

Context

13“Nʼihi ya, aga m abịada unu nʼala nʼọnọdụ unu, dịka ụgbọala nke e bujuru ukwu ọka si abịada. 14Ịgba ọsọ agaghị azọpụta ọ bụladị ndị dị nwe ụkwụ ọsọ, ndị dị ike agaghị agba onwe ha ume, ndị bụ dike nʼagha agaghị azọpụta onwe ha. 15Ndị na-agba ụta agaghị agbata ihe ọbụla, ndị nwere ụkwụ ọsọ agaghị enwekwa ike ịgba ọsọ. Ọ bụladị onye ịgba ịnyịnya doro anya agakwaghị enwe ike ịgbanarị ihe mberede nke ga-abịakwasị ya. 16Ndị obi siri ike nʼetiti ndị dike unu, ga-agbara ọtọ gbapụ ọsọ nʼụbọchị ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 2:12 Maọbụ, kwagidere

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.