Emọs 2:14
Amos 2:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ịgba ọsọ agaghị azọpụta ọ bụladị ndị dị nwe ụkwụ ọsọ, ndị dị ike agaghị agba onwe ha ume, ndị bụ dike nʼagha agaghị azọpụta onwe ha.
Amos 2:14 in English
Amos 2:14 · Berean Standard Bible
Escape will fail the swift, the strong will not prevail by his strength, and the mighty will not save his life.
Context
12“Ma unu mere* ka ndị Nazirait ahụ ṅụọ mmanya.
Unu nyekwara ndị amụma iwu ka ha kwụsị ibu amụma. 13“Nʼihi ya, aga m abịada unu nʼala nʼọnọdụ unu,
dịka ụgbọala nke e bujuru ukwu ọka si abịada. 14Ịgba ọsọ agaghị azọpụta ọ bụladị ndị dị nwe ụkwụ ọsọ,
ndị dị ike agaghị agba onwe ha ume,
ndị bụ dike nʼagha agaghị azọpụta onwe ha. 15Ndị na-agba ụta agaghị agbata ihe ọbụla,
ndị nwere ụkwụ ọsọ agaghị enwekwa ike ịgba ọsọ.
Ọ bụladị onye ịgba ịnyịnya doro anya agakwaghị enwe ike ịgbanarị ihe mberede nke ga-abịakwasị ya. 16Ndị obi siri ike nʼetiti ndị dike unu,
ga-agbara ọtọ gbapụ ọsọ nʼụbọchị ahụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
2:12 Maọbụ, kwagidere
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.