Emọs 2:10
Amos 2:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Esitere m nʼala Ijipt kpọpụta unu, duru unu gafee nʼọzara iri afọ anọ, ime ka unu nweta ala ndị Amọrait.
Amos 2:10 in English
Amos 2:10 · Berean Standard Bible
And I brought you up from the land of Egypt and led you forty years in the wilderness, that you might take possession of the land of the Amorite.
Context
8Ha na-edina nʼakụkụ ebe ịchụ aja ọbụla,
nʼelu uwe ndị anatara na mbe.
Nʼime ụlọnsọ chi ha,
ha na-aṅụ mmanya ha natara dịka ihe nra. 9“Ma a lara m ndị Amọrait nʼiyi nʼihu ha,
ndị ahụ dị ogologo dịka osisi sida,
ndị sikwara ike dịka osisi ook.
Alara m mkpụrụ ha dị nʼelu,
na mgbọrọgwụ ha niile dị nʼokpuru nʼiyi. 10Esitere m nʼala Ijipt kpọpụta unu,
duru unu gafee nʼọzara iri afọ anọ,
ime ka unu nweta ala ndị Amọrait. 11“Ahọpụtara m ụmụ unu ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma,
họpụtakwa ụfọdụ ndị okorobịa unu ka ha bụrụ Nazirait.
Unu ndị Izrel, unu ga-agọ na nke a abụghị eziokwu?”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya. 12“Ma unu mere* ka ndị Nazirait ahụ ṅụọ mmanya.
Unu nyekwara ndị amụma iwu ka ha kwụsị ibu amụma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.