Native Bible

1 Chronicles 16:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Mgbe ahụ, mmadụ niile sịrị, “Amen” na “Toonu Onyenwe anyị.”

1 Chronicles 16:36 in English

1 Chronicles 16:36 · Berean Standard Bible

Blessed be the LORD, the God of Israel, from everlasting to everlasting.” Then all the people said, “Amen!” and “Praise the LORD!”

Context

34Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 35Tikuonụ ya mkpu sị, “Zọpụta anyị, gị Chineke, Onye nzọpụta anyị; chịkọta anyị, ma napụtakwa anyị site nʼaka mba dị iche iche, ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele; ma nyaakwa isi nʼime otuto gị.” 36Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Mgbe ahụ, mmadụ niile sịrị, “Amen” na “Toonu Onyenwe anyị.” 37Devid hapụrụ Asaf na ndị Livayị ibe ya nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ ụbọchị niile ije ozi mgbe niile, dịka ọrụ ụbọchị ọbụla si dị. 38Obed-Edọm nwa Jedutun so nʼime ha, ya na Hosa, na iri mmadụ isii na asatọ ọzọ. Obed-Edọm nwa Jedutun na Hosa bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.