1 Ihe E Mere 16:37
1 Chronicles 16:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Devid hapụrụ Asaf na ndị Livayị ibe ya nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ ụbọchị niile ije ozi mgbe niile, dịka ọrụ ụbọchị ọbụla si dị.
1 Chronicles 16:37 in English
1 Chronicles 16:37 · Berean Standard Bible
So David left Asaph and his brothers there before the ark of the covenant of the LORD, to minister there regularly according to the daily requirements,
Context
35Tikuonụ ya mkpu sị, “Zọpụta anyị, gị Chineke, Onye nzọpụta anyị;
chịkọta anyị, ma napụtakwa anyị site nʼaka mba dị iche iche,
ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele;
ma nyaakwa isi nʼime otuto gị.” 36Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel,
site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
Mgbe ahụ, mmadụ niile sịrị, “Amen” na “Toonu Onyenwe anyị.” 37Devid hapụrụ Asaf na ndị Livayị ibe ya nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ ụbọchị niile ije ozi mgbe niile, dịka ọrụ ụbọchị ọbụla si dị. 38Obed-Edọm nwa Jedutun so nʼime ha, ya na Hosa, na iri mmadụ isii na asatọ ọzọ. Obed-Edọm nwa Jedutun na Hosa bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ. 39Devid nyefekwara Zadọk, onye nchụaja, na ndị nchụaja ibe ya, ọrụ ịnọ nʼihu ụlọ nzute Onyenwe anyị, nʼebe dị elu nke Gibiọn.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.