Native Bible

1 Chronicles 16:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Obed-Edọm nwa Jedutun so nʼime ha, ya na Hosa, na iri mmadụ isii na asatọ ọzọ. Obed-Edọm nwa Jedutun na Hosa bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ.

1 Chronicles 16:38 in English

1 Chronicles 16:38 · Berean Standard Bible

along with Obed-edom and his sixty-eight relatives. Obed-edom son of Jeduthun, and also Hosah, were to be gatekeepers.

Context

36Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Mgbe ahụ, mmadụ niile sịrị, “Amen” na “Toonu Onyenwe anyị.” 37Devid hapụrụ Asaf na ndị Livayị ibe ya nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ ụbọchị niile ije ozi mgbe niile, dịka ọrụ ụbọchị ọbụla si dị. 38Obed-Edọm nwa Jedutun so nʼime ha, ya na Hosa, na iri mmadụ isii na asatọ ọzọ. Obed-Edọm nwa Jedutun na Hosa bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ. 39Devid nyefekwara Zadọk, onye nchụaja, na ndị nchụaja ibe ya, ọrụ ịnọ nʼihu ụlọ nzute Onyenwe anyị, nʼebe dị elu nke Gibiọn. 40Nʼihi ịchụ aja nsure ọkụ mgbe niile nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ụtụtụ na anyasị niile nʼusoro dịka e si dee ya nʼakwụkwọ iwu Onyenwe anyị, nke o nyere ndị Izrel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.