Native Bible

1 Chronicles 16:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Tikuonụ ya mkpu sị, “Zọpụta anyị, gị Chineke, Onye nzọpụta anyị; chịkọta anyị, ma napụtakwa anyị site nʼaka mba dị iche iche, ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele; ma nyaakwa isi nʼime otuto gị.”

1 Chronicles 16:35 in English

1 Chronicles 16:35 · Berean Standard Bible

Then cry out: ‘Save us, O God of our salvation; gather and deliver us from the nations, that we may give thanks to Your holy name, that we may glory in Your praise.’

Context

33Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ, ka ha bụọ abụ ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. 34Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 35Tikuonụ ya mkpu sị, “Zọpụta anyị, gị Chineke, Onye nzọpụta anyị; chịkọta anyị, ma napụtakwa anyị site nʼaka mba dị iche iche, ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele; ma nyaakwa isi nʼime otuto gị.” 36Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Mgbe ahụ, mmadụ niile sịrị, “Amen” na “Toonu Onyenwe anyị.” 37Devid hapụrụ Asaf na ndị Livayị ibe ya nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ ụbọchị niile ije ozi mgbe niile, dịka ọrụ ụbọchị ọbụla si dị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.