1 Ihe E Mere 16:34
1 Chronicles 16:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
1 Chronicles 16:34 in English
1 Chronicles 16:34 · Berean Standard Bible
Give thanks to the LORD, for He is good; His loving devotion * endures forever.
Context
32Ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya,
ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ. 33Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ,
ka ha bụọ abụ ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị,
nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. 34Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma,
nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 35Tikuonụ ya mkpu sị, “Zọpụta anyị, gị Chineke, Onye nzọpụta anyị;
chịkọta anyị, ma napụtakwa anyị site nʼaka mba dị iche iche,
ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele;
ma nyaakwa isi nʼime otuto gị.” 36Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel,
site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
Mgbe ahụ, mmadụ niile sịrị, “Amen” na “Toonu Onyenwe anyị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.