1 Ihe E Mere 16:32
1 Chronicles 16:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya, ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ.
1 Chronicles 16:32 in English
1 Chronicles 16:32 · Berean Standard Bible
Let the sea resound, and all that fills it; let the fields exult, and all that is in them.
Context
30Maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile.
Elu ụwa niile kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya. 31Ka eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ;
ka ha kwupụta nʼetiti mba niile sị, “Onyenwe anyị na-achị.” 32Ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya,
ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ. 33Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ,
ka ha bụọ abụ ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị,
nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. 34Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma,
nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.