Native Bible

1 Chronicles 16:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ; ka ha kwupụta nʼetiti mba niile sị, “Onyenwe anyị na-achị.”

1 Chronicles 16:31 in English

1 Chronicles 16:31 · Berean Standard Bible

Let the heavens be glad, and the earth rejoice. Let them say among the nations, ‘The LORD reigns!’

Context

29E, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ ruuru aha ya, werenụ onyinye bịa nʼihu ya. Kpọọnụ isiala nye Onyenwe anyị nʼịma mma nke ịdị nsọ ya. 30Maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile. Elu ụwa niile kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya. 31Ka eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ; ka ha kwupụta nʼetiti mba niile sị, “Onyenwe anyị na-achị.” 32Ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya, ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ. 33Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ, ka ha bụọ abụ ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.