Zefanaya 3:18
Zephaniah 3:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼụbọchị mmemme a kara aka, aga m ewepụrụ gị ọdachi iru ụjụ, nke bụ ibu arụ na ihe ịta ụta dịrị gị.
Zephaniah 3:18 in English
Zephaniah 3:18 · Berean Standard Bible
“I will gather those among you who grieve over the appointed feasts, so that you will no longer suffer reproach.
Context
16Nʼụbọchị ahụ,
ihe a ga-agwa Jerusalem ga-abụ,
“Atụla egwu, gị Zayọn,
ekwela ka aka gị daa mba. 17Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị,
ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri.
Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị;
nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba,*
kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ.” 18“Nʼụbọchị mmemme a kara aka,
aga m ewepụrụ gị ọdachi iru ụjụ,
nke bụ ibu arụ na ihe ịta ụta dịrị gị. 19Nʼoge ahụ,
aga m emesi ndị ahụ niile na-emegbu gị ike.
Aga m azọpụta ndị ụkwụ rụrụ,
chịkọtakwa ndị niile e mere ka ha gaa biri nʼala ndị ọzọ.
Aga m agbanwe ihere ha ka ọ bụrụ ihe otuto
nʼihe na-ewu ewu nʼụwa ebe ha natara ihere. 20Nʼoge ahụ, aga m akpọlata unu nʼụlọ;
mgbe m ga-akpọkọta unu ọnụ.
Aga m eme ka unu na-ewu ewu
ka unu nwekwaa otuto nʼetiti mmadụ niile bi nʼụwa,
mgbe m ga-eweghachi ihe ọma unu
nʼihu anya unu.”
Ka Onyenwe anyị kwuru.
3:5 Maọbụ, ihe na-ezighị ezi
3:6 Ya bụ, nʼụzọ niile dere duu
3:7 Ọ gaghị elegharakwa ntụziaka niile m ziri ya anya
3:8 Ụbọchị m ga-ebili ịkwata ihe
3:9 Maọbụ, gbanwee okwu ha
3:10 Maọbụ, Itiopia
3:11 Ya bụ, ndị na-anya isi
3:12 Ya bụ, tụkwasị obi
3:17 Maọbụ, ọ ga-eme ka ịdị ọhụrụ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.