Zefanaya 3:19
Zephaniah 3:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge ahụ, aga m emesi ndị ahụ niile na-emegbu gị ike. Aga m azọpụta ndị ụkwụ rụrụ, chịkọtakwa ndị niile e mere ka ha gaa biri nʼala ndị ọzọ. Aga m agbanwe ihere ha ka ọ bụrụ ihe otuto nʼihe na-ewu ewu nʼụwa ebe ha natara ihere.
Zephaniah 3:19 in English
Zephaniah 3:19 · Berean Standard Bible
Behold, at that time, I will deal with all who afflict you. I will save the lame and gather the scattered; and I will appoint praise and fame for the disgraced throughout the earth.
Context
17Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị,
ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri.
Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị;
nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba,*
kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ.” 18“Nʼụbọchị mmemme a kara aka,
aga m ewepụrụ gị ọdachi iru ụjụ,
nke bụ ibu arụ na ihe ịta ụta dịrị gị. 19Nʼoge ahụ,
aga m emesi ndị ahụ niile na-emegbu gị ike.
Aga m azọpụta ndị ụkwụ rụrụ,
chịkọtakwa ndị niile e mere ka ha gaa biri nʼala ndị ọzọ.
Aga m agbanwe ihere ha ka ọ bụrụ ihe otuto
nʼihe na-ewu ewu nʼụwa ebe ha natara ihere. 20Nʼoge ahụ, aga m akpọlata unu nʼụlọ;
mgbe m ga-akpọkọta unu ọnụ.
Aga m eme ka unu na-ewu ewu
ka unu nwekwaa otuto nʼetiti mmadụ niile bi nʼụwa,
mgbe m ga-eweghachi ihe ọma unu
nʼihu anya unu.”
Ka Onyenwe anyị kwuru.
3:5 Maọbụ, ihe na-ezighị ezi
3:6 Ya bụ, nʼụzọ niile dere duu
3:7 Ọ gaghị elegharakwa ntụziaka niile m ziri ya anya
3:8 Ụbọchị m ga-ebili ịkwata ihe
3:9 Maọbụ, gbanwee okwu ha
3:10 Maọbụ, Itiopia
3:11 Ya bụ, ndị na-anya isi
3:12 Ya bụ, tụkwasị obi
3:17 Maọbụ, ọ ga-eme ka ịdị ọhụrụ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.