Zefanaya 3:17
Zephaniah 3:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị, ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri. Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị; nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba,* kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ.”
Zephaniah 3:17 in English
Zephaniah 3:17 · Berean Standard Bible
The LORD your God is among you; He is mighty to save. He will rejoice over you with gladness; He will quiet you with His love;* He will rejoice over you with singing.”
Context
15Nʼihi na Onyenwe anyị ewezugala ahụhụ dịrị gị,
chụghachikwa ndị iro gị azụ.
Onyenwe anyị, onye bụ Eze Izrel, nọ nʼetiti gị.
Ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ. 16Nʼụbọchị ahụ,
ihe a ga-agwa Jerusalem ga-abụ,
“Atụla egwu, gị Zayọn,
ekwela ka aka gị daa mba. 17Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị,
ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri.
Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị;
nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba,*
kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ.” 18“Nʼụbọchị mmemme a kara aka,
aga m ewepụrụ gị ọdachi iru ụjụ,
nke bụ ibu arụ na ihe ịta ụta dịrị gị. 19Nʼoge ahụ,
aga m emesi ndị ahụ niile na-emegbu gị ike.
Aga m azọpụta ndị ụkwụ rụrụ,
chịkọtakwa ndị niile e mere ka ha gaa biri nʼala ndị ọzọ.
Aga m agbanwe ihere ha ka ọ bụrụ ihe otuto
nʼihe na-ewu ewu nʼụwa ebe ha natara ihere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.