Native Bible

Zephaniah 3:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị, ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri. Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị; nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba,* kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ.”

Zephaniah 3:17 in English

Zephaniah 3:17 · Berean Standard Bible

The LORD your God is among you; He is mighty to save. He will rejoice over you with gladness; He will quiet you with His love;* He will rejoice over you with singing.”

Context

15Nʼihi na Onyenwe anyị ewezugala ahụhụ dịrị gị, chụghachikwa ndị iro gị azụ. Onyenwe anyị, onye bụ Eze Izrel, nọ nʼetiti gị. Ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ. 16Nʼụbọchị ahụ, ihe a ga-agwa Jerusalem ga-abụ, “Atụla egwu, gị Zayọn, ekwela ka aka gị daa mba. 17Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị, ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri. Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị; nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba,* kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ.” 18“Nʼụbọchị mmemme a kara aka, aga m ewepụrụ gị ọdachi iru ụjụ, nke bụ ibu arụ na ihe ịta ụta dịrị gị. 19Nʼoge ahụ, aga m emesi ndị ahụ niile na-emegbu gị ike. Aga m azọpụta ndị ụkwụ rụrụ, chịkọtakwa ndị niile e mere ka ha gaa biri nʼala ndị ọzọ. Aga m agbanwe ihere ha ka ọ bụrụ ihe otuto nʼihe na-ewu ewu nʼụwa ebe ha natara ihere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.