Zefanaya 3:16
Zephaniah 3:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ahụ, ihe a ga-agwa Jerusalem ga-abụ, “Atụla egwu, gị Zayọn, ekwela ka aka gị daa mba.
Zephaniah 3:16 in English
Zephaniah 3:16 · Berean Standard Bible
On that day they will say to Jerusalem: “Do not fear, O Zion; do not let your hands fall limp.
Context
14Bụọ abụ, gị nwaada Zayọn;
tie mkpu, gị Izrel.
Ṅụrịa ọṅụ, e, jiri obi gị niile ṅụrịa ọṅụ,
gị nwaada Jerusalem. 15Nʼihi na Onyenwe anyị ewezugala ahụhụ dịrị gị,
chụghachikwa ndị iro gị azụ.
Onyenwe anyị, onye bụ Eze Izrel, nọ nʼetiti gị.
Ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ. 16Nʼụbọchị ahụ,
ihe a ga-agwa Jerusalem ga-abụ,
“Atụla egwu, gị Zayọn,
ekwela ka aka gị daa mba. 17Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị,
ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri.
Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị;
nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba,*
kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ.” 18“Nʼụbọchị mmemme a kara aka,
aga m ewepụrụ gị ọdachi iru ụjụ,
nke bụ ibu arụ na ihe ịta ụta dịrị gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.