Native Bible

Zephaniah 3:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na Onyenwe anyị ewezugala ahụhụ dịrị gị, chụghachikwa ndị iro gị azụ. Onyenwe anyị, onye bụ Eze Izrel, nọ nʼetiti gị. Ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ.

Zephaniah 3:15 in English

Zephaniah 3:15 · Berean Standard Bible

The LORD has taken away your punishment; He has turned back your enemy. Israel’s King, the LORD, is among you; no longer will you fear any harm.

Context

13Ha agaghị emekwa ihe ọjọọ, ha agaghị ekwu okwu ụgha. Ire na-ekwu okwu aghụghọ agaghị adịkwa nʼọnụ ha. Ha ga-akpa nri ma dinakwa ala, ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu.” 14Bụọ abụ, gị nwaada Zayọn; tie mkpu, gị Izrel. Ṅụrịa ọṅụ, e, jiri obi gị niile ṅụrịa ọṅụ, gị nwaada Jerusalem. 15Nʼihi na Onyenwe anyị ewezugala ahụhụ dịrị gị, chụghachikwa ndị iro gị azụ. Onyenwe anyị, onye bụ Eze Izrel, nọ nʼetiti gị. Ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ. 16Nʼụbọchị ahụ, ihe a ga-agwa Jerusalem ga-abụ, “Atụla egwu, gị Zayọn, ekwela ka aka gị daa mba. 17Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị, ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri. Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị; nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba,* kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.