Native Bible

Zephaniah 3:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Site nʼofe osimiri niile nke Kush,* bụ ndị m a chụsasịrị achụsasị, ndị na-akpọ isiala nye m, ga-ewetara m onyinye dị iche iche.

Zephaniah 3:10 in English

Zephaniah 3:10 · Berean Standard Bible

From beyond the rivers of Cush * My worshipers, My scattered people, will bring Me an offering.

Context

8Nʼihi nke a, cherenụ m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “nʼụbọchị ahụ m ga-ebili ịgba akaebe.* Mkpebi m bụ ịchịkọta mba niile dị iche iche, na ịkpọkọta alaeze niile, ịwụkwasị ha oke iwe m, ọ bụladị ọnụma niile nke iwe m. Ọkụ, nke iwe si nʼekworo m, ka a ga-eji rechapụ ụwa niile. 9“Mgbe ahụ, aga m anụcha egbugbere ọnụ* ndị niile dị iche iche mee ka ọ bụrụ ihe dị ọcha, ka ha niile nwee ike ịkpọku aha Onyenwe anyị, ma jikọta aka fekwaa ya ofufe. 10Site nʼofe osimiri niile nke Kush,* bụ ndị m a chụsasịrị achụsasị, ndị na-akpọ isiala nye m, ga-ewetara m onyinye dị iche iche. 11Nʼụbọchị ahụ, gị bụ Jerusalem, agaghị eme ka ihere mee gị, nʼihi omume njehie niile i jere megide m, nʼihi na aga m esite nʼetiti gị wezuga ndị gị niile na-aṅụrị ọṅụ* na mpako ha. A gaghị ahụkwa ndị na-afụli onwe ha elu nʼugwu nsọ m. 12Ma aga m eme ka ndị dị nwayọọ nʼobi, na ndị dị umeala nʼobi fọdụ nʼetiti ndị Izrel, ha ga-agbabakwa* nʼaha Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.