Zefanaya 3:8
Zephaniah 3:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi nke a, cherenụ m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “nʼụbọchị ahụ m ga-ebili ịgba akaebe.* Mkpebi m bụ ịchịkọta mba niile dị iche iche, na ịkpọkọta alaeze niile, ịwụkwasị ha oke iwe m, ọ bụladị ọnụma niile nke iwe m. Ọkụ, nke iwe si nʼekworo m, ka a ga-eji rechapụ ụwa niile.
Zephaniah 3:8 in English
Zephaniah 3:8 · Berean Standard Bible
Therefore wait for Me,” declares the LORD, “until the day I rise to testify.* For My decision is to gather nations, to assemble kingdoms, to pour out upon them My indignation— all My burning anger. For all the earth will be consumed by the fire of My jealousy.
Context
6“Egbuchapụla m mba niile dị iche iche,
kwatukwaa ebe ha niile e wusiri ike.
Ahapụla m okporoụzọ ha ka ọ bụrụ ihe a gbahapụrụ agbahapụ,*
ọ dịkwaghị onye na-esi na ha agabiga.
A laala obodo ha niile nʼiyi,
ọ dịkwaghị onye fọdụrụ, ọ bụladị otu onye. 7Asịrị m, banyere Jerusalem,
‘Nʼezie, ị ga-atụ egwu m,
ma nabatakwa ntụziaka.’*
Mgbe ahụ, agaghị ebibi ebe mgbaba ya,
ma ọ bụkwanụ ntaramahụhụ m niile agaghị abịakwasịkwa ya.
Ma otu ọ dị, ọ nụrụ ha ọkụ nʼobi ịga nʼihu
mee omume rụrụ arụ nʼihe niile bụ nke ha mere. 8Nʼihi nke a, cherenụ m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“nʼụbọchị ahụ m ga-ebili ịgba akaebe.*
Mkpebi m bụ ịchịkọta mba niile dị iche iche,
na ịkpọkọta alaeze niile,
ịwụkwasị ha oke iwe m,
ọ bụladị ọnụma niile nke iwe m.
Ọkụ, nke iwe si nʼekworo m,
ka a ga-eji rechapụ ụwa niile. 9“Mgbe ahụ, aga m anụcha egbugbere ọnụ* ndị niile dị iche iche mee ka ọ bụrụ ihe dị ọcha,
ka ha niile nwee ike ịkpọku aha Onyenwe anyị,
ma jikọta aka fekwaa ya ofufe. 10Site nʼofe osimiri niile nke Kush,*
bụ ndị m a chụsasịrị achụsasị, ndị na-akpọ isiala nye m,
ga-ewetara m onyinye dị iche iche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.