Zefanaya 3:7
Zephaniah 3:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Asịrị m, banyere Jerusalem, ‘Nʼezie, ị ga-atụ egwu m, ma nabatakwa ntụziaka.’* Mgbe ahụ, agaghị ebibi ebe mgbaba ya, ma ọ bụkwanụ ntaramahụhụ m niile agaghị abịakwasịkwa ya. Ma otu ọ dị, ọ nụrụ ha ọkụ nʼobi ịga nʼihu mee omume rụrụ arụ nʼihe niile bụ nke ha mere.
Zephaniah 3:7 in English
Zephaniah 3:7 · Berean Standard Bible
I said, ‘Surely you will fear Me and accept correction.’ Then her dwelling place would not be cut off despite all for which I punished her. But they rose early to corrupt all their deeds.
Context
5Ma Onyenwe anyị, onye nọ nʼetiti ya bụ onye ezi omume.
Ọ nakwaghị eme ihe ọjọọ.*
Ụtụtụ niile ka ọ na-eme ka ikpe ziri ezi ya pụta ìhè;
ụbọchị ọbụla ọ naghị ahapụ igosi ya,
ma ndị ajọ omume enweghị ihere. 6“Egbuchapụla m mba niile dị iche iche,
kwatukwaa ebe ha niile e wusiri ike.
Ahapụla m okporoụzọ ha ka ọ bụrụ ihe a gbahapụrụ agbahapụ,*
ọ dịkwaghị onye na-esi na ha agabiga.
A laala obodo ha niile nʼiyi,
ọ dịkwaghị onye fọdụrụ, ọ bụladị otu onye. 7Asịrị m, banyere Jerusalem,
‘Nʼezie, ị ga-atụ egwu m,
ma nabatakwa ntụziaka.’*
Mgbe ahụ, agaghị ebibi ebe mgbaba ya,
ma ọ bụkwanụ ntaramahụhụ m niile agaghị abịakwasịkwa ya.
Ma otu ọ dị, ọ nụrụ ha ọkụ nʼobi ịga nʼihu
mee omume rụrụ arụ nʼihe niile bụ nke ha mere. 8Nʼihi nke a, cherenụ m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“nʼụbọchị ahụ m ga-ebili ịgba akaebe.*
Mkpebi m bụ ịchịkọta mba niile dị iche iche,
na ịkpọkọta alaeze niile,
ịwụkwasị ha oke iwe m,
ọ bụladị ọnụma niile nke iwe m.
Ọkụ, nke iwe si nʼekworo m,
ka a ga-eji rechapụ ụwa niile. 9“Mgbe ahụ, aga m anụcha egbugbere ọnụ* ndị niile dị iche iche mee ka ọ bụrụ ihe dị ọcha,
ka ha niile nwee ike ịkpọku aha Onyenwe anyị,
ma jikọta aka fekwaa ya ofufe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.