Native Bible

Zephaniah 3:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Mgbe ahụ, aga m anụcha egbugbere ọnụ* ndị niile dị iche iche mee ka ọ bụrụ ihe dị ọcha, ka ha niile nwee ike ịkpọku aha Onyenwe anyị, ma jikọta aka fekwaa ya ofufe.

Zephaniah 3:9 in English

Zephaniah 3:9 · Berean Standard Bible

For then I will restore pure lips to the peoples, that all may call upon the name of the LORD and serve Him shoulder to shoulder.

Context

7Asịrị m, banyere Jerusalem, ‘Nʼezie, ị ga-atụ egwu m, ma nabatakwa ntụziaka.’* Mgbe ahụ, agaghị ebibi ebe mgbaba ya, ma ọ bụkwanụ ntaramahụhụ m niile agaghị abịakwasịkwa ya. Ma otu ọ dị, ọ nụrụ ha ọkụ nʼobi ịga nʼihu mee omume rụrụ arụ nʼihe niile bụ nke ha mere. 8Nʼihi nke a, cherenụ m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “nʼụbọchị ahụ m ga-ebili ịgba akaebe.* Mkpebi m bụ ịchịkọta mba niile dị iche iche, na ịkpọkọta alaeze niile, ịwụkwasị ha oke iwe m, ọ bụladị ọnụma niile nke iwe m. Ọkụ, nke iwe si nʼekworo m, ka a ga-eji rechapụ ụwa niile. 9“Mgbe ahụ, aga m anụcha egbugbere ọnụ* ndị niile dị iche iche mee ka ọ bụrụ ihe dị ọcha, ka ha niile nwee ike ịkpọku aha Onyenwe anyị, ma jikọta aka fekwaa ya ofufe. 10Site nʼofe osimiri niile nke Kush,* bụ ndị m a chụsasịrị achụsasị, ndị na-akpọ isiala nye m, ga-ewetara m onyinye dị iche iche. 11Nʼụbọchị ahụ, gị bụ Jerusalem, agaghị eme ka ihere mee gị, nʼihi omume njehie niile i jere megide m, nʼihi na aga m esite nʼetiti gị wezuga ndị gị niile na-aṅụrị ọṅụ* na mpako ha. A gaghị ahụkwa ndị na-afụli onwe ha elu nʼugwu nsọ m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.