Native Bible

Zephaniah 3:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma aga m eme ka ndị dị nwayọọ nʼobi, na ndị dị umeala nʼobi fọdụ nʼetiti ndị Izrel, ha ga-agbabakwa* nʼaha Onyenwe anyị.

Zephaniah 3:12 in English

Zephaniah 3:12 · Berean Standard Bible

But I will leave within you a meek and humble people, and they will trust in the name of the LORD.

Context

10Site nʼofe osimiri niile nke Kush,* bụ ndị m a chụsasịrị achụsasị, ndị na-akpọ isiala nye m, ga-ewetara m onyinye dị iche iche. 11Nʼụbọchị ahụ, gị bụ Jerusalem, agaghị eme ka ihere mee gị, nʼihi omume njehie niile i jere megide m, nʼihi na aga m esite nʼetiti gị wezuga ndị gị niile na-aṅụrị ọṅụ* na mpako ha. A gaghị ahụkwa ndị na-afụli onwe ha elu nʼugwu nsọ m. 12Ma aga m eme ka ndị dị nwayọọ nʼobi, na ndị dị umeala nʼobi fọdụ nʼetiti ndị Izrel, ha ga-agbabakwa* nʼaha Onyenwe anyị. 13Ha agaghị emekwa ihe ọjọọ, ha agaghị ekwu okwu ụgha. Ire na-ekwu okwu aghụghọ agaghị adịkwa nʼọnụ ha. Ha ga-akpa nri ma dinakwa ala, ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu.” 14Bụọ abụ, gị nwaada Zayọn; tie mkpu, gị Izrel. Ṅụrịa ọṅụ, e, jiri obi gị niile ṅụrịa ọṅụ, gị nwaada Jerusalem.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.