Native Bible

Zephaniah 1:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼoge ahụ, aga m eji oriọna nyobanyechaa anya nʼakụkụ niile nke Jerusalem. Aga m ata ndị ahụ niile na-anọ nʼahụ dị jụụ ahụhụ, bụ ndị ahụ dọọrọ dịka ike mmanya a ṅụfọdụrụ aṅụfọ, ndị na-eche nʼobi ha sị, ‘O nweghị ihe Onyenwe anyị ga-eme anyị, maọbụ ihe ọma, maọbụ ihe ọjọọ.’

Zephaniah 1:12 in English

Zephaniah 1:12 · Berean Standard Bible

And at that time I will search Jerusalem with lamps and punish the men settled in complacency,* who say to themselves, ‘The LORD will do nothing, either good or bad.’

Context

10“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “olu iti mkpu akwa ga-esite nʼỌnụ Ụzọ Ama Azụ daa, mkpu nke ịkwasi akwa ike ga-ada site nʼebe obibi ọhụrụ ahụ, na ụzụ oke ntiwa site nʼugwu nta niile. 11Kwasienụ akwa ike unu ndị niile bi nʼakụkụ ebe ahịa dị; nʼihi na a ga-egbuchapụ ndị ahịa unu niile. Ndị niile na-eji ọlaọcha azụ ahịa ka a ga-ebibi. 12Nʼoge ahụ, aga m eji oriọna nyobanyechaa anya nʼakụkụ niile nke Jerusalem. Aga m ata ndị ahụ niile na-anọ nʼahụ dị jụụ ahụhụ, bụ ndị ahụ dọọrọ dịka ike mmanya a ṅụfọdụrụ aṅụfọ, ndị na-eche nʼobi ha sị, ‘O nweghị ihe Onyenwe anyị ga-eme anyị, maọbụ ihe ọma, maọbụ ihe ọjọọ.’ 13Akụ ha ga-abụ ihe a kwakọrọ nʼike, a ga-akwatukwa ụlọ ha niile. Ọ bụ ezie na ha ga-ewu ụlọ, ma ha agaghị ebi nʼime ha; ọ bụ ezie na ha ga-akọ ubi vaịnị, ma ha agaghị aṅụ mmanya si na ha.” 14Oke ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa nso, ọ na-abịakwa ọsịịsọ. Gee ntị! Iti mkpu akwa nke ụbọchị Onyenwe anyị ga-adị ilu nke ukwuu. A ga-anụkwa ụzụ ndị bụ dike nʼagha nʼebe ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.