Native Bible

Zephaniah 1:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Akụ ha ga-abụ ihe a kwakọrọ nʼike, a ga-akwatukwa ụlọ ha niile. Ọ bụ ezie na ha ga-ewu ụlọ, ma ha agaghị ebi nʼime ha; ọ bụ ezie na ha ga-akọ ubi vaịnị, ma ha agaghị aṅụ mmanya si na ha.”

Zephaniah 1:13 in English

Zephaniah 1:13 · Berean Standard Bible

Their wealth will be plundered and their houses laid waste. They will build houses but not inhabit them, and plant vineyards but never drink their wine.

Context

11Kwasienụ akwa ike unu ndị niile bi nʼakụkụ ebe ahịa dị; nʼihi na a ga-egbuchapụ ndị ahịa unu niile. Ndị niile na-eji ọlaọcha azụ ahịa ka a ga-ebibi. 12Nʼoge ahụ, aga m eji oriọna nyobanyechaa anya nʼakụkụ niile nke Jerusalem. Aga m ata ndị ahụ niile na-anọ nʼahụ dị jụụ ahụhụ, bụ ndị ahụ dọọrọ dịka ike mmanya a ṅụfọdụrụ aṅụfọ, ndị na-eche nʼobi ha sị, ‘O nweghị ihe Onyenwe anyị ga-eme anyị, maọbụ ihe ọma, maọbụ ihe ọjọọ.’ 13Akụ ha ga-abụ ihe a kwakọrọ nʼike, a ga-akwatukwa ụlọ ha niile. Ọ bụ ezie na ha ga-ewu ụlọ, ma ha agaghị ebi nʼime ha; ọ bụ ezie na ha ga-akọ ubi vaịnị, ma ha agaghị aṅụ mmanya si na ha.” 14Oke ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa nso, ọ na-abịakwa ọsịịsọ. Gee ntị! Iti mkpu akwa nke ụbọchị Onyenwe anyị ga-adị ilu nke ukwuu. A ga-anụkwa ụzụ ndị bụ dike nʼagha nʼebe ahụ. 15Ụbọchị ahụ ga-abụ ụbọchị ọnụma, ụbọchị ahụhụ na mkpagbu, ụbọchị nsogbu na mbibi, ụbọchị ọchịchịrị na oke obi ọjọọ, ụbọchị igwe ojii, na oke ọchịchịrị,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.