Zefanaya 1:15
Zephaniah 1:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụbọchị ahụ ga-abụ ụbọchị ọnụma, ụbọchị ahụhụ na mkpagbu, ụbọchị nsogbu na mbibi, ụbọchị ọchịchịrị na oke obi ọjọọ, ụbọchị igwe ojii, na oke ọchịchịrị,
Zephaniah 1:15 in English
Zephaniah 1:15 · Berean Standard Bible
That day will be a day of wrath, a day of trouble and distress, a day of destruction and desolation, a day of darkness and gloom, a day of clouds and blackness,
Context
13Akụ ha ga-abụ ihe a kwakọrọ nʼike,
a ga-akwatukwa ụlọ ha niile.
Ọ bụ ezie na ha ga-ewu ụlọ,
ma ha agaghị ebi nʼime ha;
ọ bụ ezie na ha ga-akọ ubi vaịnị,
ma ha agaghị aṅụ mmanya si na ha.” 14Oke ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa nso,
ọ na-abịakwa ọsịịsọ.
Gee ntị! Iti mkpu akwa nke ụbọchị Onyenwe anyị ga-adị ilu nke ukwuu.
A ga-anụkwa ụzụ ndị bụ dike nʼagha nʼebe ahụ. 15Ụbọchị ahụ ga-abụ ụbọchị ọnụma,
ụbọchị ahụhụ na mkpagbu,
ụbọchị nsogbu na mbibi,
ụbọchị ọchịchịrị na oke obi ọjọọ,
ụbọchị igwe ojii, na oke ọchịchịrị, 16ụbọchị opi ike na iti mkpu agha
imegide obodo niile e wusiri ike,
na imegide akụkụ ụlọ elu niile. 17“Aga m eme ka oke nhụju anya bịakwasị ndị mmadụ,
mee ka ha jegharịa dịka ndị kpuru ìsì,
nʼihi na ha emehiela megide Onyenwe anyị.
A ga-awụsịkwa ọbara ha dịka uzuzu,
tufukwaa anụ ahụ ha dịka nsị anụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.