Zefanaya 1:11
Zephaniah 1:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kwasienụ akwa ike unu ndị niile bi nʼakụkụ ebe ahịa dị; nʼihi na a ga-egbuchapụ ndị ahịa unu niile. Ndị niile na-eji ọlaọcha azụ ahịa ka a ga-ebibi.
Zephaniah 1:11 in English
Zephaniah 1:11 · Berean Standard Bible
Wail, O dwellers of the Hollow,* for all your merchants * will be silenced; all who weigh out silver will be cut off.
Context
9Nʼụbọchị ahụ, aga m ata ha ahụhụ
bụ ndị niile na-adịghị azọ ụkwụ nʼọnụ ụzọ mbata,**
ndị ji ihe ike na aghụghọ
na-emejupụta ụlọ arụsị ha. 10“Nʼụbọchị ahụ,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,
“olu iti mkpu akwa ga-esite nʼỌnụ Ụzọ Ama Azụ daa,
mkpu nke ịkwasi akwa ike ga-ada site nʼebe obibi ọhụrụ ahụ,
na ụzụ oke ntiwa site nʼugwu nta niile. 11Kwasienụ akwa ike unu ndị niile bi nʼakụkụ ebe ahịa dị;
nʼihi na a ga-egbuchapụ ndị ahịa unu niile.
Ndị niile na-eji ọlaọcha azụ ahịa ka a ga-ebibi. 12Nʼoge ahụ, aga m eji oriọna nyobanyechaa anya nʼakụkụ niile nke Jerusalem.
Aga m ata ndị ahụ niile na-anọ nʼahụ dị jụụ ahụhụ,
bụ ndị ahụ dọọrọ dịka ike mmanya a ṅụfọdụrụ aṅụfọ,
ndị na-eche nʼobi ha sị, ‘O nweghị ihe Onyenwe anyị ga-eme anyị,
maọbụ ihe ọma, maọbụ ihe ọjọọ.’ 13Akụ ha ga-abụ ihe a kwakọrọ nʼike,
a ga-akwatukwa ụlọ ha niile.
Ọ bụ ezie na ha ga-ewu ụlọ,
ma ha agaghị ebi nʼime ha;
ọ bụ ezie na ha ga-akọ ubi vaịnị,
ma ha agaghị aṅụ mmanya si na ha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.