Zefanaya 1:10
Zephaniah 1:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “olu iti mkpu akwa ga-esite nʼỌnụ Ụzọ Ama Azụ daa, mkpu nke ịkwasi akwa ike ga-ada site nʼebe obibi ọhụrụ ahụ, na ụzụ oke ntiwa site nʼugwu nta niile.
Zephaniah 1:10 in English
Zephaniah 1:10 · Berean Standard Bible
On that day,” declares the LORD, “a cry will go up from the Fish Gate, a wail from the Second District,* and a loud crashing from the hills.
Context
8“Nʼụbọchị ịchụ aja nke Onyenwe anyị ahụ,
aga m ata ndịisi niile
na ụmụ eze niile,
na ndị niile na-eyi uwe
e si na mba ọzọ bubata ahụhụ. 9Nʼụbọchị ahụ, aga m ata ha ahụhụ
bụ ndị niile na-adịghị azọ ụkwụ nʼọnụ ụzọ mbata,**
ndị ji ihe ike na aghụghọ
na-emejupụta ụlọ arụsị ha. 10“Nʼụbọchị ahụ,”
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,
“olu iti mkpu akwa ga-esite nʼỌnụ Ụzọ Ama Azụ daa,
mkpu nke ịkwasi akwa ike ga-ada site nʼebe obibi ọhụrụ ahụ,
na ụzụ oke ntiwa site nʼugwu nta niile. 11Kwasienụ akwa ike unu ndị niile bi nʼakụkụ ebe ahịa dị;
nʼihi na a ga-egbuchapụ ndị ahịa unu niile.
Ndị niile na-eji ọlaọcha azụ ahịa ka a ga-ebibi. 12Nʼoge ahụ, aga m eji oriọna nyobanyechaa anya nʼakụkụ niile nke Jerusalem.
Aga m ata ndị ahụ niile na-anọ nʼahụ dị jụụ ahụhụ,
bụ ndị ahụ dọọrọ dịka ike mmanya a ṅụfọdụrụ aṅụfọ,
ndị na-eche nʼobi ha sị, ‘O nweghị ihe Onyenwe anyị ga-eme anyị,
maọbụ ihe ọma, maọbụ ihe ọjọọ.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.