Zekaraya 9:6
Zechariah 9:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ amụtara nʼịkwa iko ga-ebichi obodo Ashdọd, aga m emekwa ka mpako ndị Filistia ndị a kwụsị.
Zechariah 9:6 in English
Zechariah 9:6 · Berean Standard Bible
A mixed race will occupy Ashdod, and I will cut off the pride of the Philistines.
Context
4Ma Onyenwe anyị ga-anapụ ya ihe niile o nwere
ọ ga-atụnye ike ya nʼoke osimiri,
ọ ga-ejikwa ọkụ repịa ya. 5Ashkelọn ga-ejupụta nʼụjọ mgbe ọ ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-eme.
Gaza kwa, ga-aṅagharị onwe ya nʼime oke ihe mgbu.
Ọ bụladị Ekrọn ga-ama jijiji nʼụjọ mgbe ha hụrụ na olileanya ha agwụla.
A ga-anapụ Gaza eze ya ma gbukwaa ya.
Ọ dịghị onye ọbụla ga-ebikwa nʼAshkelọn. 6Ụmụ amụtara nʼịkwa iko ga-ebichi obodo Ashdọd,
aga m emekwa ka mpako ndị Filistia ndị a kwụsị. 7Aga m wezuga ọbara niile site nʼọnụ ha,
wezugakwa ihe rụrụ arụ niile site nʼetiti eze ya.
Ndị niile fọdụrụ ga-abụ ndị nke Chineke anyị,
ha ga-adị ka otu agbụrụ na Juda.
Ekrọn ga-adịkwa ka ndị Jebus. 8Aga m echebe ụlọ m dịka onye nche,
ka ndị iro ghara ịbata na ya.
Ndị mkpagbu agaghị emerikwa ndị m ọzọ nʼagha,
nʼihi na anọ m na nche ugbu a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.