Native Bible

Zechariah 9:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m wezuga ọbara niile site nʼọnụ ha, wezugakwa ihe rụrụ arụ niile site nʼetiti eze ya. Ndị niile fọdụrụ ga-abụ ndị nke Chineke anyị, ha ga-adị ka otu agbụrụ na Juda. Ekrọn ga-adịkwa ka ndị Jebus.

Zechariah 9:7 in English

Zechariah 9:7 · Berean Standard Bible

I will remove the blood from their mouths and the abominations from between their teeth. Then they too will become a remnant for our God; they will become like a clan * in Judah, and Ekron will be like the Jebusites.

Context

5Ashkelọn ga-ejupụta nʼụjọ mgbe ọ ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-eme. Gaza kwa, ga-aṅagharị onwe ya nʼime oke ihe mgbu. Ọ bụladị Ekrọn ga-ama jijiji nʼụjọ mgbe ha hụrụ na olileanya ha agwụla. A ga-anapụ Gaza eze ya ma gbukwaa ya. Ọ dịghị onye ọbụla ga-ebikwa nʼAshkelọn. 6Ụmụ amụtara nʼịkwa iko ga-ebichi obodo Ashdọd, aga m emekwa ka mpako ndị Filistia ndị a kwụsị. 7Aga m wezuga ọbara niile site nʼọnụ ha, wezugakwa ihe rụrụ arụ niile site nʼetiti eze ya. Ndị niile fọdụrụ ga-abụ ndị nke Chineke anyị, ha ga-adị ka otu agbụrụ na Juda. Ekrọn ga-adịkwa ka ndị Jebus. 8Aga m echebe ụlọ m dịka onye nche, ka ndị iro ghara ịbata na ya. Ndị mkpagbu agaghị emerikwa ndị m ọzọ nʼagha, nʼihi na anọ m na nche ugbu a. 9Ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, gị Ada Zayọn! Tie mkpu ọṅụ, gị Ada Jerusalem! Nʼihi na lee, eze gị na-abịakwute gị, onye ezi omume na onye nwere mmeri, onye ewedara nʼala, nke na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, ọ bụladị nʼelu nwa ịnyịnya ibu, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.