Zekaraya 9:7
Zechariah 9:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m wezuga ọbara niile site nʼọnụ ha, wezugakwa ihe rụrụ arụ niile site nʼetiti eze ya. Ndị niile fọdụrụ ga-abụ ndị nke Chineke anyị, ha ga-adị ka otu agbụrụ na Juda. Ekrọn ga-adịkwa ka ndị Jebus.
Zechariah 9:7 in English
Zechariah 9:7 · Berean Standard Bible
I will remove the blood from their mouths and the abominations from between their teeth. Then they too will become a remnant for our God; they will become like a clan * in Judah, and Ekron will be like the Jebusites.
Context
5Ashkelọn ga-ejupụta nʼụjọ mgbe ọ ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-eme.
Gaza kwa, ga-aṅagharị onwe ya nʼime oke ihe mgbu.
Ọ bụladị Ekrọn ga-ama jijiji nʼụjọ mgbe ha hụrụ na olileanya ha agwụla.
A ga-anapụ Gaza eze ya ma gbukwaa ya.
Ọ dịghị onye ọbụla ga-ebikwa nʼAshkelọn. 6Ụmụ amụtara nʼịkwa iko ga-ebichi obodo Ashdọd,
aga m emekwa ka mpako ndị Filistia ndị a kwụsị. 7Aga m wezuga ọbara niile site nʼọnụ ha,
wezugakwa ihe rụrụ arụ niile site nʼetiti eze ya.
Ndị niile fọdụrụ ga-abụ ndị nke Chineke anyị,
ha ga-adị ka otu agbụrụ na Juda.
Ekrọn ga-adịkwa ka ndị Jebus. 8Aga m echebe ụlọ m dịka onye nche,
ka ndị iro ghara ịbata na ya.
Ndị mkpagbu agaghị emerikwa ndị m ọzọ nʼagha,
nʼihi na anọ m na nche ugbu a. 9Ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, gị Ada Zayọn!
Tie mkpu ọṅụ, gị Ada Jerusalem!
Nʼihi na lee, eze gị na-abịakwute gị,
onye ezi omume na onye nwere mmeri,
onye ewedara nʼala, nke na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu,
ọ bụladị nʼelu nwa ịnyịnya ibu, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.