Zekaraya 9:4
Zechariah 9:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Onyenwe anyị ga-anapụ ya ihe niile o nwere ọ ga-atụnye ike ya nʼoke osimiri, ọ ga-ejikwa ọkụ repịa ya.
Zechariah 9:4 in English
Zechariah 9:4 · Berean Standard Bible
Behold, the Lord will impoverish her and cast her wealth into the sea,* and she will be consumed by fire.
Context
2Otu ahụkwa ka ọ dị Hamat, nke dị ya nso;
tinyekwara Taịa na Saịdọn, ọ bụ ezie na ha bụ ndị maara ihe nke ukwu. 3Taịa ewuolara onwe ya ebe e wusiri ike,
tụkọba ọlaọcha dịka aja,
na ọlaedo dịka uzuzu nke okporoụzọ. 4Ma Onyenwe anyị ga-anapụ ya ihe niile o nwere
ọ ga-atụnye ike ya nʼoke osimiri,
ọ ga-ejikwa ọkụ repịa ya. 5Ashkelọn ga-ejupụta nʼụjọ mgbe ọ ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-eme.
Gaza kwa, ga-aṅagharị onwe ya nʼime oke ihe mgbu.
Ọ bụladị Ekrọn ga-ama jijiji nʼụjọ mgbe ha hụrụ na olileanya ha agwụla.
A ga-anapụ Gaza eze ya ma gbukwaa ya.
Ọ dịghị onye ọbụla ga-ebikwa nʼAshkelọn. 6Ụmụ amụtara nʼịkwa iko ga-ebichi obodo Ashdọd,
aga m emekwa ka mpako ndị Filistia ndị a kwụsị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.