Native Bible

Zechariah 9:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu ahụkwa ka ọ dị Hamat, nke dị ya nso; tinyekwara Taịa na Saịdọn, ọ bụ ezie na ha bụ ndị maara ihe nke ukwu.

Zechariah 9:2 in English

Zechariah 9:2 · Berean Standard Bible

and also against Hamath, which borders it, as well as Tyre and Sidon, though they are very shrewd.

Context

1Okwu Amụma. Nke a bụ okwu Onyenwe anyị megide ala Hadrak, na obodo Damaskọs ka ọ ga-ezukwa ike, nʼihi nʼebe Onyenwe anyị nọ ka anya mmadụ niile na ebo niile nke Izrel dị. 2Otu ahụkwa ka ọ dị Hamat, nke dị ya nso; tinyekwara Taịa na Saịdọn, ọ bụ ezie na ha bụ ndị maara ihe nke ukwu. 3Taịa ewuolara onwe ya ebe e wusiri ike, tụkọba ọlaọcha dịka aja, na ọlaedo dịka uzuzu nke okporoụzọ. 4Ma Onyenwe anyị ga-anapụ ya ihe niile o nwere ọ ga-atụnye ike ya nʼoke osimiri, ọ ga-ejikwa ọkụ repịa ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.