Zekaraya 9:2
Zechariah 9:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu ahụkwa ka ọ dị Hamat, nke dị ya nso; tinyekwara Taịa na Saịdọn, ọ bụ ezie na ha bụ ndị maara ihe nke ukwu.
Zechariah 9:2 in English
Zechariah 9:2 · Berean Standard Bible
and also against Hamath, which borders it, as well as Tyre and Sidon, though they are very shrewd.
Context
1Okwu Amụma.
Nke a bụ okwu Onyenwe anyị megide ala Hadrak,
na obodo Damaskọs ka ọ ga-ezukwa ike,
nʼihi nʼebe Onyenwe anyị nọ ka anya mmadụ niile
na ebo niile nke Izrel dị. 2Otu ahụkwa ka ọ dị Hamat, nke dị ya nso;
tinyekwara Taịa na Saịdọn, ọ bụ ezie na ha bụ ndị maara ihe nke ukwu. 3Taịa ewuolara onwe ya ebe e wusiri ike,
tụkọba ọlaọcha dịka aja,
na ọlaedo dịka uzuzu nke okporoụzọ. 4Ma Onyenwe anyị ga-anapụ ya ihe niile o nwere
ọ ga-atụnye ike ya nʼoke osimiri,
ọ ga-ejikwa ọkụ repịa ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.