Zekaraya 9:3
Zechariah 9:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Taịa ewuolara onwe ya ebe e wusiri ike, tụkọba ọlaọcha dịka aja, na ọlaedo dịka uzuzu nke okporoụzọ.
Zechariah 9:3 in English
Zechariah 9:3 · Berean Standard Bible
Tyre has built herself a fortress; she has heaped up silver like dust, and gold like the dirt of the streets.
Context
1Okwu Amụma.
Nke a bụ okwu Onyenwe anyị megide ala Hadrak,
na obodo Damaskọs ka ọ ga-ezukwa ike,
nʼihi nʼebe Onyenwe anyị nọ ka anya mmadụ niile
na ebo niile nke Izrel dị. 2Otu ahụkwa ka ọ dị Hamat, nke dị ya nso;
tinyekwara Taịa na Saịdọn, ọ bụ ezie na ha bụ ndị maara ihe nke ukwu. 3Taịa ewuolara onwe ya ebe e wusiri ike,
tụkọba ọlaọcha dịka aja,
na ọlaedo dịka uzuzu nke okporoụzọ. 4Ma Onyenwe anyị ga-anapụ ya ihe niile o nwere
ọ ga-atụnye ike ya nʼoke osimiri,
ọ ga-ejikwa ọkụ repịa ya. 5Ashkelọn ga-ejupụta nʼụjọ mgbe ọ ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-eme.
Gaza kwa, ga-aṅagharị onwe ya nʼime oke ihe mgbu.
Ọ bụladị Ekrọn ga-ama jijiji nʼụjọ mgbe ha hụrụ na olileanya ha agwụla.
A ga-anapụ Gaza eze ya ma gbukwaa ya.
Ọ dịghị onye ọbụla ga-ebikwa nʼAshkelọn.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.