Zekaraya 13:6
Zechariah 13:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na onye ọbụla ajụọ, ‘Gịnị bụ ọnya ndị a niile dị gị nʼahụ?’ Ha ga-azaghachi, ‘Ọnya ndị etipụtara m nʼụlọ ndị enyi m.’
Zechariah 13:6 in English
Zechariah 13:6 · Berean Standard Bible
If someone asks him, ‘What are these wounds on your chest *?’ he will answer, ‘These are the wounds I received in the house of my friends.’
Context
4“Nʼụbọchị ahụ, ihere ga-emekwa ndị amụma nʼihi ibu amụma banyere ọhụ nke ha hụrụ. Ha agaghị eyikwa uwe ajị anụ nke ndị amụma na-eyi nʼihi iduhie ndị mmadụ, 5Onye ọbụla nʼime ha ga-asịkwa, ‘Abụghị m onye amụma, onye ọrụ ubi ka m bụ, ọ bụ ihe si nʼala ka m ji azụ onwe m site na mgbe m bụ okorobịa.’ 6Ọ bụrụ na onye ọbụla ajụọ, ‘Gịnị bụ ọnya ndị a niile dị gị nʼahụ?’ Ha ga-azaghachi, ‘Ọnya ndị etipụtara m nʼụlọ ndị enyi m.’ 7“Teta nʼụra, gị mma agha, imegide onye ọzụzụ atụrụ m,
na imegide nwoke ibe m, nke nọ m nso,”
otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
“Tigbuo onye ọzụzụ atụrụ,
igwe atụrụ* ga-agbasasịkwa.
Aga m eweli aka m megide ndị dị nta. 8Nʼala ahụ niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,
“Ụzọ mmadụ abụọ nʼime ụzọ atọ ka a ga-etida,
ma otu ụzọ nʼime ụzọ atọ ga-afọdụ nʼime ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.