Zekaraya 13:7
Zechariah 13:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Teta nʼụra, gị mma agha, imegide onye ọzụzụ atụrụ m, na imegide nwoke ibe m, nke nọ m nso,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. “Tigbuo onye ọzụzụ atụrụ, igwe atụrụ* ga-agbasasịkwa. Aga m eweli aka m megide ndị dị nta.
Zechariah 13:7 in English
Zechariah 13:7 · Berean Standard Bible
Awake, O sword, against My Shepherd, against the man who is My Companion, declares the LORD of Hosts. Strike the Shepherd, and the sheep will be scattered,* and I will turn My hand against the little ones.
Context
5Onye ọbụla nʼime ha ga-asịkwa, ‘Abụghị m onye amụma, onye ọrụ ubi ka m bụ, ọ bụ ihe si nʼala ka m ji azụ onwe m site na mgbe m bụ okorobịa.’ 6Ọ bụrụ na onye ọbụla ajụọ, ‘Gịnị bụ ọnya ndị a niile dị gị nʼahụ?’ Ha ga-azaghachi, ‘Ọnya ndị etipụtara m nʼụlọ ndị enyi m.’ 7“Teta nʼụra, gị mma agha, imegide onye ọzụzụ atụrụ m,
na imegide nwoke ibe m, nke nọ m nso,”
otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
“Tigbuo onye ọzụzụ atụrụ,
igwe atụrụ* ga-agbasasịkwa.
Aga m eweli aka m megide ndị dị nta. 8Nʼala ahụ niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,
“Ụzọ mmadụ abụọ nʼime ụzọ atọ ka a ga-etida,
ma otu ụzọ nʼime ụzọ atọ ga-afọdụ nʼime ya. 9Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ a fọdụrụ ka m ga-ewebata nʼime ọkụ.
Aga m eji ọkụ nụchaa ha dịka e si anụcha ọlaọcha,
jiri ọkụ nwaa ha dịka e si anwa ọlaedo.
Ha ga-akpọku aha m,
aga m azakwa ha.
Aga m asịkwa, ‘Ndị a bụ ndị m,’
Ha onwe ha ga-asịkwa, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke anyị.’ ”
13:7 Ya bụ, igwe atụrụ nke ọ na-achị
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.