Zekaraya 13:8
Zechariah 13:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼala ahụ niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “Ụzọ mmadụ abụọ nʼime ụzọ atọ ka a ga-etida, ma otu ụzọ nʼime ụzọ atọ ga-afọdụ nʼime ya.
Zechariah 13:8 in English
Zechariah 13:8 · Berean Standard Bible
And in all the land, declares the LORD, two-thirds will be cut off and perish, but a third will be left in it.
Context
6Ọ bụrụ na onye ọbụla ajụọ, ‘Gịnị bụ ọnya ndị a niile dị gị nʼahụ?’ Ha ga-azaghachi, ‘Ọnya ndị etipụtara m nʼụlọ ndị enyi m.’ 7“Teta nʼụra, gị mma agha, imegide onye ọzụzụ atụrụ m,
na imegide nwoke ibe m, nke nọ m nso,”
otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
“Tigbuo onye ọzụzụ atụrụ,
igwe atụrụ* ga-agbasasịkwa.
Aga m eweli aka m megide ndị dị nta. 8Nʼala ahụ niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya,
“Ụzọ mmadụ abụọ nʼime ụzọ atọ ka a ga-etida,
ma otu ụzọ nʼime ụzọ atọ ga-afọdụ nʼime ya. 9Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ a fọdụrụ ka m ga-ewebata nʼime ọkụ.
Aga m eji ọkụ nụchaa ha dịka e si anụcha ọlaọcha,
jiri ọkụ nwaa ha dịka e si anwa ọlaedo.
Ha ga-akpọku aha m,
aga m azakwa ha.
Aga m asịkwa, ‘Ndị a bụ ndị m,’
Ha onwe ha ga-asịkwa, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke anyị.’ ”
13:7 Ya bụ, igwe atụrụ nke ọ na-achị
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.