Native Bible

Zechariah 13:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Nʼụbọchị ahụ, ihere ga-emekwa ndị amụma nʼihi ibu amụma banyere ọhụ nke ha hụrụ. Ha agaghị eyikwa uwe ajị anụ nke ndị amụma na-eyi nʼihi iduhie ndị mmadụ,

Zechariah 13:4 in English

Zechariah 13:4 · Berean Standard Bible

And on that day every prophet who prophesies will be ashamed of his vision, and he will not put on a hairy cloak in order to deceive.

Context

2“Nʼụbọchị ahụ, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwubiri, aga m ebipụ aha arụsị niile dị nʼala ahụ, a gaghị echetakwa ha ọzọ. Aga m esitekwa nʼala a wezuga ma ndị amụma ma mmụọ nke adịghị ọcha niile. 3Ọ bụrụkwa na onye ọbụla a ga nʼihu na-ebu amụma, nne na nna ndị mụrụ ya ga-asị ya, ‘Ị ghaghị ịnwụ nʼihi na i kwuola okwu ụgha nʼaha Onyenwe anyị.’ Mgbe onye dị otu a bukwara amụma, ọ bụ nne na nna ya ga-eji ùbe magbuo ya. 4“Nʼụbọchị ahụ, ihere ga-emekwa ndị amụma nʼihi ibu amụma banyere ọhụ nke ha hụrụ. Ha agaghị eyikwa uwe ajị anụ nke ndị amụma na-eyi nʼihi iduhie ndị mmadụ, 5Onye ọbụla nʼime ha ga-asịkwa, ‘Abụghị m onye amụma, onye ọrụ ubi ka m bụ, ọ bụ ihe si nʼala ka m ji azụ onwe m site na mgbe m bụ okorobịa.’ 6Ọ bụrụ na onye ọbụla ajụọ, ‘Gịnị bụ ọnya ndị a niile dị gị nʼahụ?’ Ha ga-azaghachi, ‘Ọnya ndị etipụtara m nʼụlọ ndị enyi m.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.