Native Bible

Song of Songs 6:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ m nke onye m hụrụ nʼanya, onye m hụrụ nʼanya bụkwa nke m. Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi.

Song of Songs 6:3 in English

Song of Songs 6:3 · Berean Standard Bible

I belong to my beloved and he belongs to me; he pastures his flock among the lilies.

Context

1Gị onye mara mma nʼetiti ndị inyom, ebee ka onye ị hụrụ nʼanya jere? Olee ụzọ o sitere? Ka anyị soro gị chọọ ya. 2Ọ gara nʼubi ya a gbara ogige, nʼebe ihe ndina ya nke e fesara ụda na-esi isi ụtọ, ijegharị nʼetiti okoko urodi, na ịchịkọta okoko lili. 3Abụ m nke onye m hụrụ nʼanya, onye m hụrụ nʼanya bụkwa nke m. Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi. 4Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma dịka Tịaza, ị mara mma nke ukwu dịka Jerusalem, ị dị ebube ka usuu ndị agha ji ọkọlọtọ.* Ị dị mma ile anya dịka Jerusalem; Ị dị ka ndị agha bu ọkọlọtọ. 5Wepụ anya gị nʼebe m nọ, nʼihi na i jirila anya gị dọta m. Agịrị isi gị dị ka igwe ewu* nke na-arịdata site nʼugwu Gilead.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.