Abụ nke Abụ 6:3
Song of Songs 6:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Abụ m nke onye m hụrụ nʼanya, onye m hụrụ nʼanya bụkwa nke m. Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi.
Song of Songs 6:3 in English
Song of Songs 6:3 · Berean Standard Bible
I belong to my beloved and he belongs to me; he pastures his flock among the lilies.
Context
1Gị onye mara mma nʼetiti ndị inyom,
ebee ka onye ị hụrụ nʼanya jere?
Olee ụzọ o sitere?
Ka anyị soro gị chọọ ya. 2Ọ gara nʼubi ya a gbara ogige,
nʼebe ihe ndina ya nke e fesara ụda na-esi isi ụtọ,
ijegharị nʼetiti okoko urodi,
na ịchịkọta okoko lili. 3Abụ m nke onye m hụrụ nʼanya, onye m hụrụ nʼanya bụkwa nke m.
Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi. 4Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma dịka Tịaza, ị mara mma nke ukwu dịka Jerusalem, ị dị ebube ka usuu ndị agha ji ọkọlọtọ.*
Ị dị mma ile anya dịka Jerusalem;
Ị dị ka ndị agha bu ọkọlọtọ. 5Wepụ anya gị nʼebe m nọ,
nʼihi na i jirila anya gị dọta m.
Agịrị isi gị dị ka igwe ewu*
nke na-arịdata site nʼugwu Gilead.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.