Native Bible

Song of Songs 6:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ gara nʼubi ya a gbara ogige, nʼebe ihe ndina ya nke e fesara ụda na-esi isi ụtọ, ijegharị nʼetiti okoko urodi, na ịchịkọta okoko lili.

Song of Songs 6:2 in English

Song of Songs 6:2 · Berean Standard Bible

My beloved has gone down to his garden, to the beds of spices, to pasture his flock in the gardens and to gather lilies.

Context

1Gị onye mara mma nʼetiti ndị inyom, ebee ka onye ị hụrụ nʼanya jere? Olee ụzọ o sitere? Ka anyị soro gị chọọ ya. 2Ọ gara nʼubi ya a gbara ogige, nʼebe ihe ndina ya nke e fesara ụda na-esi isi ụtọ, ijegharị nʼetiti okoko urodi, na ịchịkọta okoko lili. 3Abụ m nke onye m hụrụ nʼanya, onye m hụrụ nʼanya bụkwa nke m. Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi. 4Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma dịka Tịaza, ị mara mma nke ukwu dịka Jerusalem, ị dị ebube ka usuu ndị agha ji ọkọlọtọ.* Ị dị mma ile anya dịka Jerusalem; Ị dị ka ndị agha bu ọkọlọtọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.