Abụ nke Abụ 6:4
Song of Songs 6:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma dịka Tịaza, ị mara mma nke ukwu dịka Jerusalem, ị dị ebube ka usuu ndị agha ji ọkọlọtọ.* Ị dị mma ile anya dịka Jerusalem; Ị dị ka ndị agha bu ọkọlọtọ.
Song of Songs 6:4 in English
Song of Songs 6:4 · Berean Standard Bible
You are as beautiful, my darling, as Tirzah, as lovely as Jerusalem, as majestic as troops with banners.
Context
2Ọ gara nʼubi ya a gbara ogige,
nʼebe ihe ndina ya nke e fesara ụda na-esi isi ụtọ,
ijegharị nʼetiti okoko urodi,
na ịchịkọta okoko lili. 3Abụ m nke onye m hụrụ nʼanya, onye m hụrụ nʼanya bụkwa nke m.
Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi. 4Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma dịka Tịaza, ị mara mma nke ukwu dịka Jerusalem, ị dị ebube ka usuu ndị agha ji ọkọlọtọ.*
Ị dị mma ile anya dịka Jerusalem;
Ị dị ka ndị agha bu ọkọlọtọ. 5Wepụ anya gị nʼebe m nọ,
nʼihi na i jirila anya gị dọta m.
Agịrị isi gị dị ka igwe ewu*
nke na-arịdata site nʼugwu Gilead. 6Eze gị dị ka igwe atụrụ
nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta.
Nke ọbụla chi ụmụ abụọ,
ọ dịghịkwa nke nwa ya furu efu nʼetiti ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.