Abụ nke Abụ 6:5
Song of Songs 6:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Wepụ anya gị nʼebe m nọ, nʼihi na i jirila anya gị dọta m. Agịrị isi gị dị ka igwe ewu* nke na-arịdata site nʼugwu Gilead.
Song of Songs 6:5 in English
Song of Songs 6:5 · Berean Standard Bible
Turn your eyes away from me, for they have overcome me. Your hair is like a flock of goats streaming down from Gilead.
Context
3Abụ m nke onye m hụrụ nʼanya, onye m hụrụ nʼanya bụkwa nke m.
Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi. 4Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma dịka Tịaza, ị mara mma nke ukwu dịka Jerusalem, ị dị ebube ka usuu ndị agha ji ọkọlọtọ.*
Ị dị mma ile anya dịka Jerusalem;
Ị dị ka ndị agha bu ọkọlọtọ. 5Wepụ anya gị nʼebe m nọ,
nʼihi na i jirila anya gị dọta m.
Agịrị isi gị dị ka igwe ewu*
nke na-arịdata site nʼugwu Gilead. 6Eze gị dị ka igwe atụrụ
nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta.
Nke ọbụla chi ụmụ abụọ,
ọ dịghịkwa nke nwa ya furu efu nʼetiti ha. 7Agba ntị gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị
dị ka pomegranet e kere abụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.