Native Bible

Revelation 7:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

‘Agụụ agaghị agụkwa ha ọzọ. Akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ mgbe ọbụla. Anyanwụ agaghị achakwa ha ọzọ,’* okpomọkụ ọbụla agaghị erute ebe ha nọ.

Revelation 7:16 in English

Revelation 7:16 · Berean Standard Bible

‘Never again will they hunger, and never will they thirst; nor will the sun beat down upon them, nor any scorching heat.’*

Context

14Asịrị m, “Onyenwe m, ọ bụ gị maara.” Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ndị sitere nʼime oke mkpagbu ahụ pụta. Ha bụ ndị sachara uwe ha, mee ha ka ha dịrị ọcha site nʼọbara Nwa Atụrụ ahụ. 15Ọ bụ nke a mere, “ha ji guzoro nʼihu ocheeze Chineke na-efe ya ofufe ehihie na abalị nʼime ụlọnsọ ya. Onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ ga-ekpuchikwa ha. 16‘Agụụ agaghị agụkwa ha ọzọ. Akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ mgbe ọbụla. Anyanwụ agaghị achakwa ha ọzọ,’* okpomọkụ ọbụla agaghị erute ebe ha nọ. 17Nʼihi na Nwa Atụrụ ahụ nke nọ nʼetiti ocheeze ahụ ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ ha; ‘ọ ga-edurukwa ha jee nʼisi mmiri nke ndụ ahụ.’* ‘Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọbụla site nʼanya ha.’*” 7:6 Nʼebe a Manase nwa Josef, weere ọnọdụ Dan. 7:16 Aịz 49:10 7:17 Aịz 49:10 7:17 Aịz 25:8

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.