Mkpughe 7:14
Revelation 7:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Asịrị m, “Onyenwe m, ọ bụ gị maara.” Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ndị sitere nʼime oke mkpagbu ahụ pụta. Ha bụ ndị sachara uwe ha, mee ha ka ha dịrị ọcha site nʼọbara Nwa Atụrụ ahụ.
Revelation 7:14 in English
Revelation 7:14 · Berean Standard Bible
“Sir,” I answered, “you know.” So he replied, “These are the ones who have come out of the great tribulation; they have washed their robes and made them white in the blood of the Lamb.
Context
12na-asị,
“Amen!
Ngọzị niile na otuto niile,
na amamihe niile na ekele niile na nsọpụrụ niile
na ike niile na ume niile,
dịrị Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi.
Amen.” 13Mgbe ahụ, otu nʼime ndị okenye ahụ zara m sị, “Ị maara ndị ahụ, ndị a e gbokwasịrị uwe ọcha ahụ, ebee ka ha siri pụta?” 14Asịrị m, “Onyenwe m, ọ bụ gị maara.”
Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ndị sitere nʼime oke mkpagbu ahụ pụta. Ha bụ ndị sachara uwe ha, mee ha ka ha dịrị ọcha site nʼọbara Nwa Atụrụ ahụ. 15Ọ bụ nke a mere,
“ha ji guzoro nʼihu ocheeze Chineke
na-efe ya ofufe ehihie na abalị nʼime ụlọnsọ ya.
Onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ
ga-ekpuchikwa ha. 16‘Agụụ agaghị agụkwa ha ọzọ.
Akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ mgbe ọbụla.
Anyanwụ agaghị achakwa ha ọzọ,’*
okpomọkụ ọbụla agaghị erute ebe ha nọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.