Mkpughe 7:15
Revelation 7:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ nke a mere, “ha ji guzoro nʼihu ocheeze Chineke na-efe ya ofufe ehihie na abalị nʼime ụlọnsọ ya. Onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ ga-ekpuchikwa ha.
Revelation 7:15 in English
Revelation 7:15 · Berean Standard Bible
For this reason, they are before the throne of God and serve Him day and night in His temple; and the One seated on the throne will spread His tabernacle over them.
Context
13Mgbe ahụ, otu nʼime ndị okenye ahụ zara m sị, “Ị maara ndị ahụ, ndị a e gbokwasịrị uwe ọcha ahụ, ebee ka ha siri pụta?” 14Asịrị m, “Onyenwe m, ọ bụ gị maara.”
Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ndị sitere nʼime oke mkpagbu ahụ pụta. Ha bụ ndị sachara uwe ha, mee ha ka ha dịrị ọcha site nʼọbara Nwa Atụrụ ahụ. 15Ọ bụ nke a mere,
“ha ji guzoro nʼihu ocheeze Chineke
na-efe ya ofufe ehihie na abalị nʼime ụlọnsọ ya.
Onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ
ga-ekpuchikwa ha. 16‘Agụụ agaghị agụkwa ha ọzọ.
Akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ mgbe ọbụla.
Anyanwụ agaghị achakwa ha ọzọ,’*
okpomọkụ ọbụla agaghị erute ebe ha nọ. 17Nʼihi na Nwa Atụrụ ahụ nke nọ nʼetiti ocheeze ahụ
ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ ha;
‘ọ ga-edurukwa ha jee nʼisi mmiri nke ndụ ahụ.’*
‘Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọbụla site nʼanya ha.’*”
7:6 Nʼebe a Manase nwa Josef, weere ọnọdụ Dan.
7:16 Aịz 49:10
7:17 Aịz 49:10
7:17 Aịz 25:8
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.