Native Bible

Psalms 89:44 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

I meela ka ịma mma ya gwụsịa. Ị tụdakwala ocheeze ya nʼala.

Psalms 89:44 in English

Psalms 89:44 · Berean Standard Bible

You have ended his splendor and cast his throne to the ground.

Context

42I meela ka aka nri ndị iro ya dị elu; mekwaa ka ndị iro ya ṅụrịa ọṅụ. 43I meela ka aka o ji jide mma agha ya sụọ ngọngọ, i nyereghị ya aka mgbe agha dara. 44I meela ka ịma mma ya gwụsịa. Ị tụdakwala ocheeze ya nʼala. 45I meela ka ụbọchị ndụ nke okorobịa ya dị mkpụmkpụ. I ji ihere dịka akwa kpuchie ya. 46Ruo ole mgbe Onyenwe anyị, ka ị ga-ezonarị onwe gị? Ruo ole mgbe ka iwe gị dị ukwuu ga-eregide dịka ọkụ?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.