Native Bible

Psalms 89:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

I meela ka aka nri ndị iro ya dị elu; mekwaa ka ndị iro ya ṅụrịa ọṅụ.

Psalms 89:42 in English

Psalms 89:42 · Berean Standard Bible

You have exalted the right hand of his foes; You have made all his enemies rejoice.

Context

40Ị kụtuola mgbidi gbara ya gburugburu, i meela ka ebe ya niile e wusiri ike bụrụ ihe dapịara adapịa. 41Ndị niile si ụzọ ahụ na-agafe, ezuruchaala ihe niile o nwere. Ndị agbataobi ya na-akwakwa ya emo. 42I meela ka aka nri ndị iro ya dị elu; mekwaa ka ndị iro ya ṅụrịa ọṅụ. 43I meela ka aka o ji jide mma agha ya sụọ ngọngọ, i nyereghị ya aka mgbe agha dara. 44I meela ka ịma mma ya gwụsịa. Ị tụdakwala ocheeze ya nʼala.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.