Abụ Ọma 89:43
Psalms 89:43 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
I meela ka aka o ji jide mma agha ya sụọ ngọngọ, i nyereghị ya aka mgbe agha dara.
Psalms 89:43 in English
Psalms 89:43 · Berean Standard Bible
You have bent the edge of his sword and have not sustained him in battle.
Context
41Ndị niile si ụzọ ahụ na-agafe, ezuruchaala ihe niile o nwere.
Ndị agbataobi ya na-akwakwa ya emo. 42I meela ka aka nri ndị iro ya dị elu;
mekwaa ka ndị iro ya ṅụrịa ọṅụ. 43I meela ka aka o ji jide mma agha ya sụọ ngọngọ,
i nyereghị ya aka mgbe agha dara. 44I meela ka ịma mma ya gwụsịa.
Ị tụdakwala ocheeze ya nʼala. 45I meela ka ụbọchị ndụ nke okorobịa ya dị mkpụmkpụ.
I ji ihere dịka akwa kpuchie ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.