Abụ Ọma 89:25
Psalms 89:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
M ga-edo aka ya nʼoke osimiri,* dokwaa aka nri ya nʼosimiri niile.*
Psalms 89:25 in English
Psalms 89:25 · Berean Standard Bible
I will set his hand over the sea, and his right hand upon the rivers.
Context
23Aga m etigbu ndị iro ya niile nʼihu ya.
Aga m emekwa ka ndị niile na-akpọ ya asị laa nʼiyi. 24Ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi ga-adịnyere ya,
site nʼaha m, a ga-ebuli mpi ya elu. 25M ga-edo aka ya nʼoke osimiri,*
dokwaa aka nri ya nʼosimiri niile.* 26Ọ ga-akpọ m sị m, ‘Ị bụ Nna m,
bụrụkwa Chineke m, na oke Nkume nzọpụta m.’ 27Aga m eme ya nwa mbụ m,
onye kachasị dị elu nʼebe eze niile nke ụwa nọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.