Abụ Ọma 89:11
Psalms 89:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa, ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya.
Psalms 89:11 in English
Psalms 89:11 · Berean Standard Bible
The heavens are Yours, and also the earth. The earth and its fullness You founded.
Context
9Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ;
mgbe ebili mmiri ya na-amali elu; i na-eme ka ha dajụọ. 10Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu;
jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị. 11Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa,
ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya. 12Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda;
Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị. 13Aka gị ka e mejupụtara nʼike;
aka gị dị ike, a na-ebuli aka nri gị elu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.